Isaiah 24

Mbibi Onyenwe anyị ga-ebibi ụwa

1Lee, na Onyenwe anyị na-aga ịgba ụwa ọtọ.
Ọ na-aga ime ka ọ tọgbọrọ nʼefu.
Ọ na-aga ibibicha ihe dị nʼelu ụwa,
mee ka ndị bi nʼime ya gbasasịa.
2Otu ihe ahụ ka ọ ga-eme mmadụ niile,
nye ndị nchụaja ma ndị mmadụ,
nye ụmụodibo na ndị nwe ha,
nye ndị odibo nwanyị, na nne ha ukwu,
nye ndị na-azụ ihe a na-ere ere, na ndị na-ere ihe orire;
nye ndị na-ebinye ego, na ndị a na-ebinye ego;
nye ndị ji ụgwọ, na ndị e ji ụgwọ.
3O nweghị onye ọ ga-ahapụ.
A ga-agba ala ahụ ọtọ kwakọrọ ihe niile dị nʼime ya.
Nke a ka Onyenwe anyị kwuru.

4Ala atakọchaala, ma kpọnwụọ.
Ụwa ahụjuola anya ma kpọnwụọ.
Eluigwe na nʼụwa so na-ahụjukwa anya.
5Ụwa bụ ihe e merụrụ emerụ site na ndị ya;
ha enupula isi nʼiwu niile,
ha agbanweela ụkpụrụ ya,
mebie ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ.
6Ya mere, ọbụbụ ọnụ na-eripịa ụwa;
ndị bi nʼime ya aghaghị ịnatakwa ikpe ọmụma ha.
Ya mere ndị niile bi nʼụwa na-ere ọkụ,
ọ bụkwa naanị mmadụ ole na ole fọdụrụ.
7Mmanya ọhụrụ atakọrọla, osisi vaịnị akpọnwụọkwala,
nʼihi ya, ndị ahụ niile ọṅụ na-ejupụta nʼobi ha na-asụ ude.
8Egwu ụtọ niile akwụsịla,
mkpọtụ nke ndị na-eri oriri dị iche iche akwụsịla.
Ụda obi ụtọ nke ụbọ akwara adịghịkwa.
9Abụ obi ụtọ nke ya na mmanya na-eso adịghịkwa;
mmanya dị ike na-akụzi ilu nʼọnụ ndị na-aṅụ ya.
10Obodo atọgbọrọla nʼefu;
a kpọchichaala ọnụ ụzọ e si abata ụlọ ndị mmadụ ka onye ọbụla ghara inwe ike ịbata.
11Igwe ndị mmadụ nọ nʼokporoụzọ na-eti mkpu nʼihi na mmanya adịghịkwa.
Ọṅụ adịghịkwa,
otu a, ewezugakwala obi ụtọ site nʼụwa.
12Obodo ahụ aghọọla mkpọmkpọ ebe,
e tikpọọla ọnụ ụzọ ya niile.
13Otu a ka ọ ga-adị nʼụwa niile,
nakwa nʼetiti mba niile,
dịka mgbe a na-etitusi mkpụrụ dị nʼelu osisi oliv,
maọbụ mgbe ahapụrụ ụfọdụ mkpụrụ grepu nʼelu osisi mgbe a ghọchasịrị ihe ubi.

14Ma ndị niile fọdụrụ ga-eti mkpu ọṅụ;
ndị nọ nʼọdịda anyanwụ ga-eto ịdị ebube nke Onyenwe anyị.
15Ndị nọ nʼọwụwa anyanwụ ga-enye Onyenwe anyị otuto.
Ndị bi nʼala nta niile osimiri gbara gburugburu
ga-ebuli aha Onyenwe anyị, Chineke Izrel elu.
16Anyị ga-anụ abụ ọma dị iche iche site na nsọtụ ụwa.
Ha ga-abụ abụ na-asị, “Otuto dịrị Onye ezi omume ahụ.”

Ma nʼezie, o nweghị olileanya dịịrị m. “Lee ka anụ ahụ m si na-akpọnwụ!
Ahụhụ dịrị m!
Nʼihi na ndị ahụ na-ekwesighị ntụkwasị obi ereela anyị.
Akpịrị ego ha ka ha ji refuo anyị.”
17Ihe egwu, na olulu, na igbudu nke onye na-esi ọnya dị na-eche unu,
unu ndị niile bi nʼụwa.
18Onye ọbụla nʼime unu nke gbara ọsọ nʼihi ihe egwu
ga-adaba nʼolulu;
onye ọbụla sitekwara nʼolulu rịpụta
ga-azọnye ụkwụ ya nʼọnya.

Nʼihi na mmiri nke ịla nʼiyi esitela na mbara eluigwe na-ezokwasị unu.
Ntọala ụwa na-amakwa jijiji.
19Ụwa adapịasịala;
ụwa agbawasịala;
e jirila oke ike nugharịa ụwa.
20Ụwa ga-adagbugharị dịka onye mmanya na-egbu.
Ọ ga-aṅagharịkwa dịka osisi nke oke ifufe na-efegharị.
Ọ daala, ọ pụghịkwa ibili ọzọ,
nʼihi na njehie ya dị arọ na-anyịdakwa ya.

21Nʼụbọchị ahụ,
Onyenwe anyị ga-ata ike usuu niile dị nʼeluigwe ahụhụ.
Ọ ga-atakwa ndị eze niile nʼụwa ahụhụ.
22A ga-achịkọta ha dịka ndị mkpọrọ,
kpọchiekwa ha nʼụlọ mkpọrọ
nʼebe ahụ ka ha ga-anọgide,
tutu ruo mgbe a ga-ekpe ha ikpe.
23Ọnwa ga-ada mba,
anwụ ka ihere ga-eme;
nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-achị
nʼugwu Zayọn nakwa nʼime Jerusalem,
ọ ga-eji oke ebube chịa nʼihu ndị okenye ya.
Copyright information for IboBIU